Abù Ọma 38 IGBOB

Abù Ọma Devid, ime ka echeta echeta.

1 Jehova, abalaram nba n'iwe-Gi:Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi.

2 N'ihi na àkú-Gi nile efedakwasiwom,Aka-Gi adakwasiwokwam.

3 Ọ dighi izu-okè ọ bula di n'anu-arum n'ihi iwe-Gi;Ọ dighi kwa udo ọ bula di n'ọkpukpum nile n'ihi nmehiem.

4 N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim:Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́.

5 Ufiri-utalim nile nēsì ísì, nāb͕u kwa miri,N'ihi uchem b͕agọro ab͕agọ.

6 Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku;Ogologo ubọchi nile ka m'jeghariworo nēyi uwe-nkpe.

7 N'ihi na úkwùm juputara na nruru-ọku;Ọ dighi kwa izu-okè ọ bula di n'anu-arum.

8 Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku:Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim.

9 Onye-nwe-ayi, n'iru Gi ka ichọsi-ikem nile di;Ize-umem ezonarighi kwa Gi.

10 Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la:Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n'arum.

11 Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim;Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya.

12 Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà;Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n'iyì di iche iche,Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n'uche ogologo ubọchi nile.

13 Ma mu onwem, dika onye nti chiri, adighm-anu ihe;Adikwam ka onye-ob͕i nke nādighi-asaghe ọnu-ya.

14 E, adim ka madu nke nādighi-anu iheOnye iba-nba ọ bula nādighi n'ọnu-ya.

15 N'ihi na Gi, Jehova, ka m'chereworo:Gi onwe-gi gāza, Onye-nwe-ayi, Chinekem.

16 N'ihi na asirim, Ka ha ghara iṅuri ọṅu n'arum:Mb͕e anēwezuga ukwum n'ọnọdu-ya, ha mere onwe-ha ka ha di uku imegidem.

17 N'ihi na mu owem gaje ije nsukwra-achi,Ihe-nb͕um di kwa na ncherita-irum mb͕e nile.

18 N'ihi na m'gēgosi ajọ omumem;M'gēcheb͕u onwem bayere nmehiem.

19 Ma ndi-irom nādi ndu, nwe ume:Ha ba-kwa-ra uba, bú ndi nākpọm asì n'uzọ okwu-ugha.

20 Ndi ahu kwa nke nākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi iheNēmegidem, n'ihi na anamab͕aso ezi ihe.

21 Arapulam, Jehova:Chinekem, anọlam n'ebe di anya.