Abù Ọma 9 IGBOB

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Muth-labben. Abù Ọma Devid.

1 M'gēji obim nile kele Jehova;M'gākọ kwa akukọ oké ọlu-Gi nile.

2 M'gāṅuri ọṅu, obim gātọkwam utọ, nime Gi:M'gābùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu;

3 Mb͕e ndi-irom laghachiri azu,Su ngọngọ, si kwa n'iru Gi la n'iyì.

4 N'ihi na I kpewo ikpem ziri ezi na okwu-ikpem;I nọduru n'oche-eze, buru onye-ikpe nēme ezi omume.

5 I basiwo mba nile ọzọ nba, I mewo ka ndi nēmebi iwu la n'iyì,I hichapuwo aha-ha rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6 Ndi-iro agwusiwo, ha bu nkpọnkpọ ebe rue mb͕e ebighi-ebi;Ọzọ, obodo nile nke I ropuworo,Ncheta-ha, ọbuná nke obodo ahu, alawo n'yì.

7 Ma Jehova nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi:O doziwo oche-eze-Ya ikpe ikpe.

8 Ya onwe-ya gēkpe uwa dum madu bi ikpe n'ezi omume,Ọ gēkpe ndi nile di n'uwa ikpe n'izi-ezi.

9 Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu,Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà;

10 Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi;N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.

11 Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion:Gosinu omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.

12 N'ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha:O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala.

13 Merem amara, Jehova;Hu nweda-n'alam nke sitere n'aka ndi nākpọm asì,Gi Onye nēbulim elu site n'ọnu-uzọ-ama ọnwu;

14 Ka m'we kọ akukọ otuto-Gi nile:N'ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion,Ka m'ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi.

15 Mba nile ọzọ emikpuwo n'olùlù ha mere:N'ub͕u nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha.

16 Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo:N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah

17 Ndi nēmebi iwu gālaghachi n'ala mọ,Bú mba nile ndi nēchezo Chineke.

18 N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka agēchezọ ob͕eye,Olile-anya nke ndi di ume-ala n'obi agaghi-ala n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi.

19 Bilie, Jehova; ekwela ka madu di ike:Ka ekpe mba nile ikpe n'iru Gi.

20 Jehova, doro ha ihe-egwu:Ka mba nile mara na nání madu ka ha bu. Selah