Abù Ọma 86 IGBOB

Ekpere Devid.

1 Jehova, tọ nti-Gi n'ala, zam;N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu.

2 Debe nkpuru-obim; n'ihi na onye-ebere ka m'bu:Gi onwe-gi Chinekem, zọputa orù-Gi nke nātukwasi obi na Gi.

3 Merem amara, Onye-nwe-ayi;N'ihi na Gi ka m'nākpọku ogologo ubọchi nile.

4 Me ka nkpuru-obi orù-Gi ṅuria;N'ihi na ọ bu Gi, Onye-nwe-ayi, ka m'nēbuli nkpuru-obim nye.

5 N'ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, di nma, I bu kwa onye nāb͕aghara nmehie,I nāba kwa uba n'ebere n'aru ndì nile nākpọku Gi.

6 Jehova, ge nti n'ekperem;Ṅa kwa nti n'olu arirọ-amaram nile.

7 N'ubọchi nkpàm m'gākpọku Gi;N'ihi na I gāzam.

8 Ọ dighi onye di ka Gi n'etiti chi nile, Onye-nwe-ayi;Ọ dighi kwa ọlu di ka ọlu-Gi nile.

9 Mba nile ndi I meworo gābia kpọ isí ala n'iru Gi, Onye-nwe-ayi;Ha gāsọpuru kwa aha-Gi.

10 N'ihi na onye uku ka I bu, I nālu kwa oké ọlu di iche iche:Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi.

11 Zim uzọ-Gi Jehova; m'gējeghari n'ezi-okwu-Gi:Me ka obim di n'otù itu egwu aha-Gi.

12 M'gēji obim nile kele Gi, Onye-nwe-ayi, Chineke;M'gāsọpuru kwa aha-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

13 N'ihi na ebere-Gi di uku n'arum;I siwo n'ala-mọ nke dichasi ala naputa nkpuru-obim.

14 Chineke, ndi-nganga ebiliwo imegidem,Nzukọ ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim,Ha edoghi kwa Gi n'iru ha.

15 Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, bu Chineke Nke nwere obi-ebere, Onye di kwa amara,Nke nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere na ezi-okwu.

16 Chem iru, me-kwa-ram amaraNye orù-Gi ike-Gi,Zọputa kwa nwa-nwoke nke orù-Gi nwayi.