1 Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di.Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka ajọ omume-ha buru ihe-árú;Ọ dighi onye nēme ezi ihe.
2 Chineke siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya,Ihu ma ọ di onye nwere uche,Nke nāchọ Chineke.
3 Ha nile n'otù n'otù alaghachiwo azu; ha ab͕aruwo n'otù dika miri;Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.
4 Ndi nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe?Bú ndi riworo nri site n'iri ndim,Ma ha akpọkughi Chineke.
5 N'ebe ahu ka ha turu oké egwu, n'ebe oké egwu nādigh:N'ihi na Chineke esesawo ọkpukpu nke onye nāma ulo-ikwū-ya imegide gi;I mewo ka ihere me ha, n'ihi na Chineke ajuwo ha.