Abù Ọma 40 IGBOB

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Elesirim anya Jehova ike;Ọ we tọrọm nti-Ya n'ala, nu ntikum.

2 Ọ we me ka m'si n'olùlù nbibi, n'apiti nke ala urọ, rigoputa;Ọ we me ka ukwum abua guzo n'elu nkume di elu, Ọ nēme ka nzọ-ukwum nile guzosie ike.

3 Ọ we tiye abù ọhu n'ọnum, bú otuto diri Chineke-ayi:Ọtutu madu gāhu ya, tua egwu, We tukwasi Jehova obi.

4 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke meworo Jehova ka Ọ buru ihe-ntukwasi-obi-ya,Ọ cheghi kwa ndi-nganga iru, ma-ọbu ndi nējehi n'uzọ okwu-ugha.

5 Ọtutu ihe ka Gi onwe-gi meworo, Jehova, bú Chinekem, bú oké ọlu-Gi nile,Na èchìchè-Gi nile n'ebe ayi nọ:Apughi idoro Gi ha n'usoro;Asi na agamegosi kwu kwa okwu bayere ha,Ha kariri igu-ọnu.

6 Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ;Nti abua ka I ràpúworom:Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo.

7 Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom;N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem:

8 Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke;Iwu-Gi di kwa nime obim.

9 Ezisawom ozi ọma nke ezi omume nime nkpọkọta-Gi bara uba;Le, adighm-eb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnum abua,Jehova, Gi onwe-gi amawo.

10 Ekpuchighm ezi omume-Gi nime obim;Ekwusawom ikwesi-ntukwasi-obi-Gi na nzọputa-Gi:Ezonarighm nkpọkọta-Gi bara uba ebere-Gi na ezi-okwu-Gi

11 Gi onwe-gi, Jehova, ebochilaram obi-ebere-Gi nile:Ka ebere-Gi na ezi-okwu-Gi nēchezim mb͕e nile.

12 N'ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu,Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ;Ha kariri agiri-isi nile nke isim n'uba, obim arapuwokwam.

13 Jehova, ka ọ tọ Gi inaputam:Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.

14 Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù,Bú ndi nāchọ nkpuru-obim ikpochapu ya:Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere,Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.

15 Ka ha tọb͕ọrọ n'efu n'ihi ihere-ha,Bú ndi nāsim, Ehe, ehe.

16 Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi:Ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile,Ka Jehova di uku.