Abù Ọma 89 IGBOB

Maschil Itan, bú onye-Ezrahait.

1 Ebere nile nke jehova ka m'gābù abù-ha rue mb͕e ebighi-ebi:Ọb͕ọ nile ka m'gēwere ọnum me ka ha mara ikwesi-ntukwasi-obi-Gi.

2 N'ihi na asiwom, Rue mb͕e ebighi-ebi ka agēwuli ebere elu dika ulo;Elu-igwe, I gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi guzosie ike nime ha.

3 Mu na onye M'rọputara ab͕awo ndu,Aṅuworom Devid, bú orùm, iyi;

4 Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme ka nkpuru-gi guzosie ike,M'gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile. Selah

5 Elu-igwe gēkele kwa oké ọlu-Gi, Jehova;Kele kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nime nkpọkọta nke ndi nsọ.

6 N'ihi na ònye nime mbara-ígwé ka agēji turu Jehova?Ònye yiri Jehova n'etiti umu Chineke?

7 Ọ bu Chineke Nke anāmara jijiji ri nne n'ìzù nzuzo nke ndi nsọ,Ọ bu kwa Onye anātu egwu Ya kari ndi nile di Ya buruburu.

8 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha,Ònye di ike dika Gi, Ja?Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu.

9 Gi onwe-gi nāchi nbili-elu nke oké osimiri:Mb͕e nmali-miri-ya nile nēbuli onwe-ha elu, Gi onwe-gi nēme ka ha dajua.

10 Gi onwe-gi azọpiawo Rehab, dika onye eb͕uru eb͕u;I werewo ogwe-aka nke ike-Gi chusa ndi-iro-Gi.

11 Gi nwe elu-igwe, Gi nwe kwa uwa:Elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya, Gi onwe-gi atọwo ntọ-ala-ha.

12 Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha:Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi.

13 Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya:Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu.

14 Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Gi:Ebere na ezi-okwu nāga n'iru Gi.

15 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu nke mara olu iti-nkpu ahu:Jehova, n'ìhè nke iru-Gi ka ha nēje ije.

16 N'aha-Gi ka ha nēteghari egwú ọṅù ogologo ubọchi nile:Ọ bu kwa n'ezi omume-Gi ka ha nādi elu.

17 N'ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu:Ọ bu kwa n'utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu.

18 N'ihi na Jehova nwe ọta-ayi;Ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel nwe eze-ayi.

19 Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù,Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike;Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu.

20 Achọtawom Devid, bú orùm;Ewerewom manu nsọm te ya:

21 Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ;Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume.

22 Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede;Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala.

23 M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya,Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe.

24 Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya:Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu.

25 M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri,Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile.

26 Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu,Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.

27 Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam,Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ.

28 Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem,Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi.

29 M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi,Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe.

30 Ọ buru na umu-ya arapu iwum,Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile;

31 Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ,Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu;

32 M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha,Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha.

33 Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem,M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim.

34 M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ,Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta.

35 Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi;M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli;

36 Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi,Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum.

37 Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi;Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah

38 Ma Gi onwe-gi achipuwo, ju kwa aju.I wesabigawo onye-Gi etere manu iwe ókè.

39 I sọwo ọb͕ub͕a-ndu nke orù-Gi oyi:I mewo ka okpu-eze-ya ghara idi nsọ ọbuná rue ala.

40 I tiwawo ogige-ya nile;I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia.

41 Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ apunarawo ya ihe:Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta.

42 I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu;I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria.

43 Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu,I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha.

44 I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi,I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala.

45 I bilatawo ubọchi nile ọ bu okorọbia:I werewo ihere kpuchie ya n'aru. Selah

46 Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēzobe onwe-gi ebighi-ebi?Rùe ole mb͕e ka ọnuma-Gi ganēre dika ọku?

47 Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu:Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye?

48 Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya,Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n'aka ala-mọ? Selah

49 Òle ebe ebere, mbu Gi nile di. Onye-nwe-ayi,Nke I ṅuru Devid iyi bayere ha n'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi?

50 Onye-nwe-ayi, cheta ita-uta ndi-orù-Gi;Eburuwom n'obim ita-uta nke ndi nile di iche iche bara uba;

51 Nke ndi-iro-Gi jiworo ta uta, Jehova,Nke ha jiworo ta nzọ-ukwu nile nke onye-Gi etere manu uta.