10 Site n'iwe-Gi na ọnuma-Gi:N'ihi na I buliwom elu, we tufuem.
11 Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu;Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala.
12 Ma Gi onwe-gi, Jehova, nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi;Ncheta-Gi nādiru kwa ọb͕ọ nile.
13 Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n'aru Zaion:N'ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n'ihi na mb͕e akara àkà abiawo.
14 N'ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ,Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara.
15 Mba nile gātu kwa egwu aha Jehova,Eze nile nke uwa gātu kwa egwu ebube-Gi:
16 N'ihi na Jehova ewuwo Zaion,O mewo Onwe-ya ka ahú Ya nime ebube-ya.