23 Madu nāpu ga ọlu-yaGa kwa ọlu-ubi-ya rue anyasi.
24 Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova!N'amam-ihe ka I meworo ha nile:Uwa juputara n'ihe I nwetara.
25 Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n'aka abua,Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu,Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku.
26 N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga;Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.
27 Ha nile nēle anya Gi,Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.
28 I nēnye ha, ha achikọta ya;I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha.
29 I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji;I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume,We laghachi n'ájá-ha.