26 N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga;Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.
27 Ha nile nēle anya Gi,Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.
28 I nēnye ha, ha achikọta ya;I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha.
29 I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji;I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume,We laghachi n'ájá-ha.
30 I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha;I we me ka iru ala di ọhu.
31 Ka ebube Jehova dirue mb͕e ebighi-ebi;Ka Jehova ṅuria n'ọlu-Ya nile:
32 Onye nēlegide uwa, o we ma jijiji;Ọ nēmetu ugwu aka, ha we kwua anwuru-ọku.