6 I were ob͕u-miri kpuchie ya dika uwe;N'elu ugwu nile ka miri nēguzo.
7 Site n'ibasi-nba-ike-Gi ha nāb͕alaga;Site n'olu éb͕è-elu-igwe-Gi ha nāzọli ọsọsọ;
8 (Ugwu nile nārigo, ndagwurugwu nile nārida;)Rue ebe ahu nke I tọrọri ntọ-ala-ya nye ha.
9 I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya;Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa.
10 Gi Onye nēzipu isi-iyi di iche iche ka ha ba na ndagwurugwu;N'etiti ugwu ka ha nērù:
11 Ha nēnye anu ọhia ọ bula miri iṅu;Inyinya-ibu-ọhia nēmeju akpiri-ikpọ-nku-ha.
12 N'akuku ha ka anu-ufe nke elu-igwe bi,Ha nēsi n'etiti alaka-osisi me ka olu-ha da udà.