14 Ọ kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha;O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;
15 Si, Unu emetula ndim etere manu aka,Unu emejọ-kwa-la ndi-amumam.
16 O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu;Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri.
17 O zìri otù nwoke iga n'iru ha;Erere Josef ka ọ buru orù:
18 Ha were ab͕u kesie ukwu-ya abua ike;Nkpuru-obi-ya bàra n'ígwè:
19 Rue mb͕e okwu-Ya rère;Okwu-ọnu Jehova nuchara ya.
20 Eze ziri ozi, we tọpu ya;Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n'ulo-nkpọrọ.