2 Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.
3 Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya:Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.
4 Nāchọnu Jehova na ike-Ya;Chọnu iru-Ya mb͕e nile.
5 Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo;Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;
6 Unu nkpuru Abraham, bú orù-Ya,Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.
7 Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi:N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di.
8 O chetawo ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi,Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;