26 O zigara Moses, bú orù-Ya,Na Eron onye Ọ rọputara.
27 Ha doro n'etiti ha ihe iriba-ama-Ya nile,Do kwa ihe-ebube di iche iche n'ala Ham.
28 O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie;Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile.
29 Ọ b͕anwere miri-ha ka ha ghọ ọbara,We me ka azù-ha nwua.
30 Ala-ha nuputara awọ,N'ime-ulo nile nke ndi-eze-ha.
31 O kwuru okwu, odudu we bia,Na anwu ntà n'ókè-ala-ha nile.
32 O mere oké miri-ozuzo-ha ka ha ghọ ákú-miri-ígwé,Na ọku nēnwu enwu n'ala-ha.