29 Ọ b͕anwere miri-ha ka ha ghọ ọbara,We me ka azù-ha nwua.
30 Ala-ha nuputara awọ,N'ime-ulo nile nke ndi-eze-ha.
31 O kwuru okwu, odudu we bia,Na anwu ntà n'ókè-ala-ha nile.
32 O mere oké miri-ozuzo-ha ka ha ghọ ákú-miri-ígwé,Na ọku nēnwu enwu n'ala-ha.
33 O we tie osisi vine nile ha na osisi fig nile ha ihe;Tiji kwa osisi nke ókè-ala-ha.
34 O kwuru okwu, igurube we da,Ha na umu-igurube nādighi ọnu-ọgugu,
35 Ha we richapu ihe-ọkukú ọ bula di n'ala-ha,Richapu kwa nkpuru nke ala-ubi-ha.