33 O we tie osisi vine nile ha na osisi fig nile ha ihe;Tiji kwa osisi nke ókè-ala-ha.
34 O kwuru okwu, igurube we da,Ha na umu-igurube nādighi ọnu-ọgugu,
35 Ha we richapu ihe-ọkukú ọ bula di n'ala-ha,Richapu kwa nkpuru nke ala-ubi-ha.
36 O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha,Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile.
37 O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo:Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n'etiti ebo-Ya nile.
38 Ijipt ṅuriri mb͕e ha putara;N'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ha.
39 Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi;Na ọku inye ìhè n'abali.