37 O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo:Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n'etiti ebo-Ya nile.
38 Ijipt ṅuriri mb͕e ha putara;N'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ha.
39 Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi;Na ọku inye ìhè n'abali.
40 Ha riọrọ, O we me ka nnunu quail bia,O were kwa nri nke elu-igwe me ka afọ ju ha.
41 O meghere oké nkume, miri we rùputa;Ha nērù n'ala ọkpọ-nku dika osimiri.
42 N'ihi na O chetara okwu nsọ Ya,Na Abraham, bú orù-Ya.
43 O we me ka ndi-Ya ji obi-utọ puta,Me kwa ndi Ọ rọputaworo ka ha ji iti-nkpu-ọṅù puta.