11 Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha:Ọ dighi otù onye nime ha fọduru.
12 Ha we kwere okwu-Ya nile;Ha nābù abù otuto-Ya.
13 Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa;Ha echeghi ndum-ọdu-Ya:
14 Ha we chọ ajọ ọchichọ n'ọzara,We nwa Chineke n'ala tọb͕ọrọ n'efu.
15 O we nye ha ihe ha riọrọ;Ma O zitere aru-ọtita na nkpuru-obi-ha.
16 Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha,Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.
17 Ala nēmeghe, we loda Detan,Kpuchi kwa nzukọ Abairam.