16 Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha,Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.
17 Ala nēmeghe, we loda Detan,Kpuchi kwa nzukọ Abairam.
18 Ọku we nēre n'etiti nzukọ-ha;Ire-ọku nērepia ndi nēmebi iwu.
19 Ha nēme nwa-ehi na Horeb,We kpọ isi ala nye ihe awuru awu.
20 Ha we b͕anwe nsọpuru-haN'ihe-atù nke ehi nāta ihe akuru n'ala.
21 Ha chezọrọ Chineke, bú Onye-nzọputa-ha,Onye nēmeri ihe uku di iche iche n'Ijipt;
22 Oké ọlu di iche iche n'ala Ham,Na ihe di egwu di iche iche n'akuku Oké Osimiri Uhie.