2 Ònye gākọ akukọ idi-ike nile nke Jehova?Ònye gēme ka anuru otuto-Ya nile?
3 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe ikpé bu,Ha na onye nēme ezi omume na mb͕e nile.
4 Chetam, Jehova, were ka ihe ndi-gi si atọ Gi utọ chetam;Were nzọputa-Gi letam:
5 Ka m'we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo,Ka m'we ṅuria n'ọṅù mba-Gi,Ka m'we soro ihe-nketa-Gi nya isi.
6 Ayi esowo nna-ayi-hà mehie,Ayi emewo ajọ omume, ayi emebiwo iwu.
7 Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n'Ijipt;Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile;Ha we nupu isi n'akuku oké osimiri, bú n'Oké Osimiri Uhie.
8 Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya,Ime ka amara idi-ike-Ya.