38 We wusi ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ, bú ọbara nke umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom,Ndi ha were chuara arusi nile nke Kenean àjà;Ewe were ọbara merua ala ahu.
39 Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú,Ha we nākwa iko n'omume nile ha.
40 Iwe Jehova we di ọku n'aru ndi-Ya,O we kpọ ihe-nketa-Ya ihe-árú.
41 O we nye ha n'aka mba di iche iche;Ndi nākpọ ha asì we nāchi ha.
42 Ndi-iro-ha meb͕u-kwa-ra ha,Ewe me ka ha ruru ala n'okpuru aka-ha.
43 Ọtutu mb͕e ka Ọ nanaputa ha;Ma ha onwe-ha nānupu isi n'okpuru Chineke na ndum-ọdu-ha,Ewe kwada ha n'ajọ omume-ha.
44 O we lekwasi ahuhu diri ha anya,Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha: