44 O we lekwasi ahuhu diri ha anya,Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha:
45 O we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya nye ha,We chègharia dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.
46 O we me ha ka enwe obi-ebere nile n'aru haN'iru ndi nile ndi nādọta ha n'agha.
47 Zọputa ayi, Jehova, bú Chineke-ayi,Chikọputa kwa ayi n'etiti mba nileIkele aha nsọ Gi,Na inya isi n'otuto-Gi.