5 Ka m'we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo,Ka m'we ṅuria n'ọṅù mba-Gi,Ka m'we soro ihe-nketa-Gi nya isi.
6 Ayi esowo nna-ayi-hà mehie,Ayi emewo ajọ omume, ayi emebiwo iwu.
7 Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n'Ijipt;Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile;Ha we nupu isi n'akuku oké osimiri, bú n'Oké Osimiri Uhie.
8 Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya,Ime ka amara idi-ike-Ya.
9 O we basiere Oké Osimiri Uhue nba, o we tasia:O we me ka ha nēje ije n'ob͕u-miri-ya nile dika ọ bu ọzara.
10 O we zọputa ha n'aka onye nākpọ ha asì,B͕aputa kwa ha n'aka onye-iro-ha.
11 Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha:Ọ dighi otù onye nime ha fọduru.