8 Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya,Ime ka amara idi-ike-Ya.
9 O we basiere Oké Osimiri Uhue nba, o we tasia:O we me ka ha nēje ije n'ob͕u-miri-ya nile dika ọ bu ọzara.
10 O we zọputa ha n'aka onye nākpọ ha asì,B͕aputa kwa ha n'aka onye-iro-ha.
11 Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha:Ọ dighi otù onye nime ha fọduru.
12 Ha we kwere okwu-Ya nile;Ha nābù abù otuto-Ya.
13 Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa;Ha echeghi ndum-ọdu-Ya:
14 Ha we chọ ajọ ọchichọ n'ọzara,We nwa Chineke n'ala tọb͕ọrọ n'efu.