14 O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta,Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha.
15 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
16 N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla,B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.
17 Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'alaSite n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha.
18 Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú;Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu.
19 Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we zọputa ha na nkpà-ha nile.
20 O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma,O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.