17 Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'alaSite n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha.
18 Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú;Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu.
19 Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we zọputa ha na nkpà-ha nile.
20 O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma,O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.
21 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
22 Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele,Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile.
23 Ndi nārida n'oké osimiri n'ub͕o,Bú ndi nēje ozi n'ọtutu miri;