20 O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma,O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.
21 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
22 Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele,Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile.
23 Ndi nārida n'oké osimiri n'ub͕o,Bú ndi nēje ozi n'ọtutu miri;
24 Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova,Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi.
25 N'ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ,Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu.
26 Ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ob͕u-miri nile:Nkpuru-obi-ha nālọ miri site n'ọnọdu ọjọ ha.