31 Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
32 Ka ha me kwa Ya ka Ọ di elu nime nkpọkọta ndi-Ya,Ka ha to kwa Ya nime nnọkọ ndi-okenye.
33 O nēme ka osimiri ghọ ọzara,O nēme kwa ebe miri nāsuputa ka ha ghọ ala kpọro nku;
34 Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú,Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.
35 Ọ nēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri,Ọ nēme kwa ka ala nke kpọrọ nku ghọ ebe miri nāsuputa.
36 O we me ka ndi agu nāgu biri n'ebe ahu,Ha we dozie obodo obibi;
37 Gha nkpuru n'ubi, kua ubi-vine di iche iche,Nweta nkepuru nke ihe-ọmume.