34 Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú,Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.
35 Ọ nēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri,Ọ nēme kwa ka ala nke kpọrọ nku ghọ ebe miri nāsuputa.
36 O we me ka ndi agu nāgu biri n'ebe ahu,Ha we dozie obodo obibi;
37 Gha nkpuru n'ubi, kua ubi-vine di iche iche,Nweta nkepuru nke ihe-ọmume.
38 Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku;Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata.
39 Ọzọ, ha nēbilata, we ruda n'ala,Site na nmeb͕u, na ihe ọjọ, na iru-újú.
40 Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha,We me ka ha kpafue nebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe uzọ nādighi.