38 Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku;Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata.
39 Ọzọ, ha nēbilata, we ruda n'ala,Site na nmeb͕u, na ihe ọjọ, na iru-újú.
40 Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha,We me ka ha kpafue nebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe uzọ nādighi.
41 Ọzọ, Ọ nēme ka ob͕eye si na nweda-n'ala nọ n'ebe di elu,Ọ nēme kwa ka ọ ghọ ab͕uru dika ìgwè ewu na aturu.
42 Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria;Ma ajọ omume nile ekpuchiwo ọnu-ya.