12 Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere;Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara.
13 Ka eriri-umu-ya diri nbipu;N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.
14 Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà;Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya.
15 Ka ha di n'iru Jehova mb͕e nile,Ka O we bipu ncheta-ha n'uwa.
16 N'ihi na o chetaghi ime ebere,O we sob͕ue nwoke ewedara n'ala na ob͕eye,Na onye obi-ya mebiri emebi, ime ka ha nwua.
17 Ọ hu-kwa-ra nkọcha n'anya, o we biakute ya;Ngọzi atọghi kwa ya utọ, o we di anya n'ebe ọ nọ.
18 O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya,O we ba nime ya dika miri,Ba kwa n'ọkpukpu-ya nile dika manu.