2 N'ihi na ọnu onye nēmebi iwu na ọnu aghughọ ka ha sagheworo megidem:Ha ewerewo ire okwu-ugha gwam okwu.
3 Ha ewerewo kwa okwu ikpọ-asì b͕am buruburu,We busom agha n'efu.
4 N'ọnọdu ihu-n'anya m'huru ha ha nēmegidem:Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere.
5 Ha we tukwasim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Na ikpọ-asì n'ọnọdu ihu-n'anyam.
6 Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya:Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya.
7 Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara;Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie.
8 Ka ubọchi-ya di ole-na-ole;Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya.