27 Ka ha mara kwa na aka-Gi ka nka bu;Gi onwe-gi, Jehova, emewo ya.
28 Ndi ahu gākọcha, ma Gi onwe-gi nāgọzi:Ha ebiliwo, ihere we me ha, ma orù-Gi gāṅuri.
29 Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe,Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda.
30 M'gēwere ọnum kele Jehova nke-uku;E, n'etiti ọtutu madu ka m'gēto Ya.