1 Na Jehova ka m'b͕abàworo:Ùnu si aṅa si nkpuru-obim,Felaganu n'ugwu-unu dika nnunu?
2 N'ihi na, le, ndi nēmebi iwu nāzọ uta-ha ukwu ikwe ya,Ha edoziwo àkù-ha n'elu eriri-uta,Ib͕a ndi obi-ha ziri ezi n'ochichiri.
3 N'ihi na anākwada ide nile;Gini ka onye ezi omume meworo?
4 Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ,Jehova, n'elu-igwe ka oche-eze-Ya di;Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu.