1 Tonu Ja.Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke nātu egwu Jehova.Nke ihe nile O nyere n'iwu nātọ utọ nke-uku.
2 Ndi-dike ka nkpuru-ya gābu n'uwa:Agāgọzi ọb͕ọ ndi ziri ezi.
3 Ihe di iche iche di oké ọnu-ahia na àkù di n'ulo-ya:Ezi omume-ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.
4 Ihè awaliwo n'ọchichiri nye ndi ziri ezi:Ọ bu onye-amara, na onye nwere obi-ebere, na onye ezi omume.
5 Ọ diri nwoke ahu nma, bú onye nēme-ebere, nēbinye kwa madu ihe;Ọ gākwagide okwu-ya nile n'ikpé.