6 N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewezuga ya n'onọdu-ya:Ihe-ncheta ebighi-ebi ka onye ezi omume gābu.
7 Ọ gaghi-esite n'ihe ọjọ anuworo tu egwu:Edoziwo obi-ya, ebe ọ nātukwasi Jehova obi.
8 Ihe anākwagide ka obi-ya bu, ọ gaghi-atu egwu,Rue mb͕e ọ gēlekwasi ndi nākpab͕u ya anya.
9 Ọ ghasawo àkù-ya, o nyewo ndi-ob͕eye ihe;Ezi omume-ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi:Agēwere nsọpuru me ka mpi-ya di elu.