10 Ulo Eron, tukwasinu Jehova obi:Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.
11 Unu ndi nātu egwu Jehova, tukwasinu Jehova obi:Iye-aka-ha na ota-ha ka Ọ bu.
12 Jehova echetawo ayi: Ọ gāgọzi ayi:Ọ gāgọzi ulo Israel;Ọ gāgọzi ulo Eron.
13 Ọ gāgọzi ndi nātu egwu Jehova,Ma ndi ntà ma ndi uku.
14 Ka Jehova tukwasiri unu madu,Ka Ọ tukwasiri unu, tukwasi-kwa-ra umu-unu.
15 Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu,Onye meworo elu-igwe na uwa.
16 Elu-igwe bu elu-igwe Jehova nwere;Ma uwa ka O nyeworo umu madu.