2 N'ìhi gini ka mba nile nāsi,Biko, òle ebe Chineke-ha nọ?
3 Ma Chineke-ayi nọ n'elu-igwe:Ihe nile nke tọrọ Ya utọ ka O meworo.
4 Arusi nile ha bu ọla-ọcha na ọla-edo,Ọlu aka madu.
5 Ha nwere ọnu, ma ha adighi-ekwu okwu;Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;
6 Ha nwere nti abua, ma ha adighi-anu ihe;Ha nwere imi, ma ha adighi-anuta ísì;
7 Ha nwere aka-ha abua, ma ha adighi-ebitu ihe;Ha nwere ukwu-ha abua, ma ha adighi-eje ije;Ha adighi-ewere akpiri-ha me uṅara.
8 Ndi nēme ha gādi ka ha:E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.