7 Ha nwere aka-ha abua, ma ha adighi-ebitu ihe;Ha nwere ukwu-ha abua, ma ha adighi-eje ije;Ha adighi-ewere akpiri-ha me uṅara.
8 Ndi nēme ha gādi ka ha:E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.
9 Israel, tukwasi Jehova obi:Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.
10 Ulo Eron, tukwasinu Jehova obi:Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.
11 Unu ndi nātu egwu Jehova, tukwasinu Jehova obi:Iye-aka-ha na ota-ha ka Ọ bu.
12 Jehova echetawo ayi: Ọ gāgọzi ayi:Ọ gāgọzi ulo Israel;Ọ gāgọzi ulo Eron.
13 Ọ gāgọzi ndi nātu egwu Jehova,Ma ndi ntà ma ndi uku.