3 Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu,Ebe nile di nkpà nke ala-mọ chọtaram:Ahuhu na iru-újú ka m'nāhu.
4 M'we kpọkue aha Jehova;Si, Biko, Jehova, me ka nkpuru-obim wepuga onwe-ya.
5 Onye-amara na onye ezi omume ka Jehova bu;E, Chineke-ayi nwere obi-ebere.
6 Onye nēdebe ndi nēnweghi uche ka Jehova bu:Enweghm ike, O we nyem nzọputa.
7 Nkpuru-obim, laghachi n'ebe-izu-ike-gi;N'ihi na Jehova emesowo gi nke-ọma.
8 N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu,I naputawo kwa anyam abua n'anya-miri,I naputawo kwa ukwum abua na nnuda anēnudam.
9 M'gējeghari n'iru JehovaN'ala nile nke ndi di ndu.