7 Nkpuru-obim, laghachi n'ebe-izu-ike-gi;N'ihi na Jehova emesowo gi nke-ọma.
8 N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu,I naputawo kwa anyam abua n'anya-miri,I naputawo kwa ukwum abua na nnuda anēnudam.
9 M'gējeghari n'iru JehovaN'ala nile nke ndi di ndu.
10 Ekwerewom, n'ihi na m'nēkwu okwu:Ewedara mu onwem n'ala nke-uku:
11 Mu onwem siri na nkujamMadu ọ bula bu onye nēkwu okwu-ugha.
12 M'gēsi aṅa nyeghachi JehovaNmeso ọma Ya nile O mesoworom?
13 Iko nke nzọputa nile ka m'gēbuli,Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.