9 M'gējeghari n'iru JehovaN'ala nile nke ndi di ndu.
10 Ekwerewom, n'ihi na m'nēkwu okwu:Ewedara mu onwem n'ala nke-uku:
11 Mu onwem siri na nkujamMadu ọ bula bu onye nēkwu okwu-ugha.
12 M'gēsi aṅa nyeghachi JehovaNmeso ọma Ya nile O mesoworom?
13 Iko nke nzọputa nile ka m'gēbuli,Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.
14 Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere,Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile.
15 Ihe di oké ọnu-ahia n'anya JehovaKa ọnwu nke diri ndi-ebere-Ya bu.