10 Mba nile ab͕awom buruburu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
11 Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
12 Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
13 I nudawom enuda ka m'we da:Ma Jehova yerem aka.
14 Ikem na abù ọmam ka Ja bu:Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.
15 Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume:Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.
16 Ebuliwo aka-nri Jehova elu:Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.