13 I nudawom enuda ka m'we da:Ma Jehova yerem aka.
14 Ikem na abù ọmam ka Ja bu:Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.
15 Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume:Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.
16 Ebuliwo aka-nri Jehova elu:Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.
17 M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu,M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja.
18 Ja adọwom aka na nti nke-uku:Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom.
19 Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume:M'gābà nime ha, m'gēkele Ja.