2 Biko, ka Israel si,Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
3 Biko, ka ulo Eron si,Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
4 Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si,Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
5 M'siri na nkpàm kpọkue Ja;Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara.
6 Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu:Gini ka madu gēmem?
7 Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka:Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì.
8 Ọ di nma ib͕abà nime JehovaKari itukwasi madu obi.