8 Ọ di nma ib͕abà nime JehovaKari itukwasi madu obi.
9 Ọ di nma ib͕abà nime JehovaKari itukwasi ndi amara aha-ha obi.
10 Mba nile ab͕awom buruburu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
11 Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
12 Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
13 I nudawom enuda ka m'we da:Ma Jehova yerem aka.
14 Ikem na abù ọmam ka Ja bu:Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.