134 B͕aputam na nmeb͕u nke madu:M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile.
135 Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè;Zíkwam ukpuru-Gi nile.
136 Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua,N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.
137 Onye ezi omume ka I bu Jehova,Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu.
138 I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omumeNa ikwesi-ntukwasi-obi di uku.
139 Ekworom ekpochapuwom,N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile.
140 Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu;Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya.