1 Jehova, zọputa; n'ihi na onye-ebere agwusiwo;N'ihi na ndi kwesiri ntukwasi-obi agwupuwo n'etiti umu madu.
2 Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya:Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu.
3 Ka Jehova bipu eb͕ub͕ere-ọnu nile nke nekwu okwu ire-utọ,Na ire nke nēkwu oké ihe:
4 Ndi siworo, Ayi nēme ire-ayi ka ọ di ike;Eb͕ub͕ere-ọnu-ayi di n'akuku ayi: ònye ka ayi nwere dika onye-nwe-ayi?