4 M'gaghi-enye anyam abua ura,M'gaghi-enye mbubere-anyam irù-ura;
5 Rue mb͕e m'gāchọtara Jehova ọnọdu,Chọtara Dike nke Jekob ebe-obibi.
6 Le, ayi nuru okwu bayere ya n'Efrata:Ayi chọtara ya n'ọhia nke oké ọhia.
7 Ka ayi ba n'ebe-obibi-Ya nile;Ka ayi kpọ isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di.
8 Bilie, Jehova, ba n'ebe-izu-ike-Gi;Gi onwe-gi, na ib͕e nke ike-Gi.
9 Ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri ezi omume dika uwe;Ka ndi-ebere-Gi tikwa nkpu ọnu.
10 N'ihi Devid, bú orù-Gi,Atugharila iru onye-Gi etere manu.