16 Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di.
17 Kelenu Onye tib͕uworo ndi-eze di uku:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
18 O b͕u-kwa-ra ndi-eze di ebube:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
19 Bú Saihon eze ndi-Amorait:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
20 Na Og eze Beshan:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
21 O we nye ala-ha ibu ihe-nketa:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
22 Iburu Israel, bú orù-Ya, ihe-nketa:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.