5 Kelenu Onye ji nghọta eme elu-igwe:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
6 Kelenu Onye meworo ala ka ọ sa mbara n'elu miri:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
7 Kelenu Onye meworo ìhè uku di iche iche:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
8 Bú anyuanwu ichi n'ehihie:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
9 Na ọnwa na kpakpando ichi n'abali:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
10 Kelenu Onye nētib͕u Ijipt nime umu-ha eburu uzọ mu:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
11 O we me ka Israel si n'etiti ha puta:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: